Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ifeanyi Ejiofor: 'Ọ bụ Emeka Offor zipuru ndị uweojii ka ha bịa be m'
Mgbe e biputara ya
Akụkọ na-apụta maka ọgbaaghara dapụtara n'obodo Oraifite, n'ụlọ Ifeanyi Ejiofor onye bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, n'izuuka atọ gara aga.
Na mkparịta ụka Ejiofor na BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Fraide, o kwuru na ọ bụ Emeka Offor zitere ndị uweojii ka ha bịa gbuo ya.
Mana ọnụ na-ekwuru Emeka Offor kwuru na ebubo ahụ bụ asị ọcha.