Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Kenneth Okonkwo: Achọrọ m ịtọpụ Enugwu steeti n'agbụ
Mgbe e biputara ya
Onye na-eme ihe nkiri na Nollywood bụ Kenneth Okonkwo (Andy Okeke) ekwupụtala mmasị ya ịzọ ọchịchị n'afọ 2019.
Ọ kwuru na ya ga-azọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti n'afọ 2019.
Kenneth gwara BBC Igbo na ya ga-eweta ọganihu ha wetara na Nollywood n'Enugwu steeti ime ka Enugwu kwụrụ chịm.
Ken Okonkwo bụ onye Nsukka ebe aka chiburu Enugwu bụ Sullivan Chime na-akwado ya.