Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Charly Boy: Iwe anyị bụ na a na-emechi ndị ntaakụkọ ọnụ
Mgbe e biputara ya
Ọ bụrụ na-enweghi ihe mgbochi ọbụla, ndị otu #Mumudondo nke Charles Oputa (Charlie Boy) akwadosila njeghari iwe ha ga-eme n'Abuja ụbọchị Wednezde maka onyeisi ụlọọrụ mgbasa Daily Independent ndị ọrụ DSS jidere.
E jidere Tony Ezimakor n'Abuja maka akụkọ ndị ụlọọrụ Daily Independent mere gbasara ego e kwuru na ndị gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ndị Boko Haram.
Ndị DSS ji Tony kamgbe ụbọchị 28 Feburuwarị afọ 2018 ka o kwuo ebe ha si weta akụkọ ahụ ha buru.