Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Onye mere MMM: Ha gwuru m chacha ruru nde 3.7
Mgbe e biputara ya
Nwaafọ Naịjirịa mere MMM nke na-achọgị ka e kwuo aha ya ekwupụtala etu ya na atụmatụ pọnzi bụ MMM siri gaa n'afọ gara aga.
Ọtụtụ ndị Naịjirịa ndị ọzọ tufuru ego ha site na atụmatụ MMM a.
Ndị ụlọrụ Nigeria Deposit Insurance Corporation kwuru na ụmụ Naịjirịa soro na ya bụ atụmatụ riri nde atọ na ọma n'ọnụọgụgụ ebe ego furu oge MMM kwasara ruru ijeri 18.
Akụkọ kwukwara na o nwere ndị nwere ọbara mgbalielu oge ọ kwasara maka ego ha niile ha mefuru.
Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ihe kpatara ụmụ Naịjirịa jiri tinye aka na ụdị atụtmatụ ahụ.