Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
'Ekwela ka Igbo nwụọ'
Mgbe e biputara ya
Onye ritere ihe nrite dịka onye bụ ọkachasị n'ide akwụkwọ na Naịjirịa n'afọ 2017 bụ Ikeogu Oke ekwuola na asụsụ Igbo agaghị anwụ ma ndị Igbo kpọọ ya mkpa.
Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye kachasị ede mbem na Naịjirịa nke a kpọrọ "Nigerian Prize of Literature" maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ “The Heresiad”.
Ihe mere akwụkwọ ahụ ọdị iche bụ na o dere ya n'usoro ndị Igbo ji agụ mbem.
Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Maazị Oke kwuru okwu gbasara nchekwa asụsụ Igbo, na onye o chere na o kwesịri ịdị n'aka ya.