Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ara m bụ oke ibu arụ nye m
Mgbe e biputara ya
Violet J kwuru na ọ nọ n'ụra mgbe ara ya bịara fagide ya n'olu chọrọ ị fagbu ya.
Mana o tiri mkpu ma bilie, ya bụrụ ara ya bịara fachie ya na nkọlọ na-ekweghi ya kuru ume.
Ihe a bụ akụkọ ọtụtụ ndị ụmụnwa nwere ara ukwu na-ahụ.
"Kamgbe ahụ anaghị m eji azụ m, arahụ ụra, kama akụkụ m" dịka Violet kwuru.
O kwuru na ihe ga-egbo nsogbu ahụ bụ ịwa ara ya.