Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Gọọmentị ga-akwụrịrị anyị N30,000
Mgbe e biputara ya
Otu jịkọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) agwala onye ọbụla ka ha kwado makana abụbọ ọrụ nke ugbua ga-aka aka n'ahụ.
Onyeisioche NLC n'Enugwu steeti bụ Virginus Nwobodo, kọwara na ha ekwekọrịtala na ọ bụrụ na ndị gọvanọ kachie ntị sị na ha agaghị akwụ N30,000, abụbọ orụ nke ike ya ga-amalite n'ụbọchị Nọvemba 6, 2018.