Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Anyị aṅụbeghi miri tọgbọ iko - Onyeisi ndị Nigeria na-azụ ahịa - Kizito Obiora
Mgbe e biputara ya
Dịka Kizito Ikechukwu Obiora bụ onyeisi "Nigerian Union of Traders Association" - bụ otu ndị Naịjiriịa na-azụ ahịa na mba Gana - siri kọwaara BBC Igbo ihe na-ebe ka na-ebekwa na mpaghara Ashanti na mba ahụ.
Site na Fraịde bụ abalị iri na anọ nke ọnwa Junn ruo ụbọchị Tusde nke izu a bụ izu atọ nke ọnwa Juun, ndị amaghị ndị ha bụ wakpochara ndị Naịjirịa ma manye ha ka ha gbachie ụlọahịa ha.