Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Etu esi gbuo Fada Paul Offu n'Ihe
Mgbe e biputara ya
Ọ bụ be Fada ọzọ bụ ọyị ya ka Fada Paul Offu na-aga tupu ozute ndị omekome durala ya mmụọ, dịka a gwara BBC Igbo.
Fada Benjamin Achi bụ ọnụ na-ekwuru Ụka Katọlịk n'Enugwu sị na ọ bụ ebe ha nọ nzukọ ndị Fada emere n'Emene dị n'Enugwu n'ụbọchị Tụsde bụ nke abụọ n'ọnwa Ọgọst ka ozi rutere na Fada nwụrụ.
Ọ sị na ọ bụ n'ụzọ si Ihe gawa Agbụdụ ka mkpa mkpa a kpara.