Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Anyị anọrọla n'ime ụlọ ruo izuụka atọ na Chaịna maka Coronavirus
Mgbe e biputara ya
Chukwuma Nzube na-agụ mahadum na Wuhan dị na Chaina bụ ebe nje coronavirus na-akpọtụ.
Ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ gọọmentị Chaịna na-enye ha nri ugboro atọ kwa ụbọchị, ma na-enyekwa ha ihe ndi ọzọ eji ijikọta ndụ.
Mana nwa amadị a si na nke kachasị ewe iwe bụ na ndị Naịjirịa agwabeghi ha okwu ọbụla.
Maazị Nzube si na ihe ha chọrọ ugbua bụ ka enya ha ohere ịlọta Naijirịa dịka ndị si mba ndị ọzọ na-eme.
Lee ihe ndị ọzọ okwuru na ihe nkiri a.