Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Leohand Lyeanyi: Etu nwunye ya si eri uju ọnwụ ya
Mgbe e biputara ya
Nneka Onyia bụ nwunye Leohand Lyeanyi Onyia, onye a na-ache na ndị uweojii India gburu akwaala arịrị ma kọwaa etu ọnwụ di si emetụta ya.
Ọ gwara BBC Igbo etu o si na ọ bụ di ya na-akpọte ya n'ụra kwa ụtụtụ ọbụla mana kamgbe ọ nwụrụ nke ahụ adịghị emezikwa.
Nneka sị na ya na di ya kwuru okwu n'ekwentị n'abalị Satọde mana ozi ọzọ o nwetere bụ na di dọzi n'ozu na mba India.
Mgbe ọ jụrụ kedụ ka ihe si mee, a gwara ya na ọ bụ ndị uweojii ji ihe kugbuo ya.
Kirie ihe o kwuru n'uju.