Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ntezi Community: Ha kwenyere na ha bụ Igbo mana ha anaghị asụ Igbo
Mgbe e biputara ya
Ndị obodo Ntezi dị n'agbata Abakaliki na Cross River kwenyere na ha bụ ndị Igbo na-agbanyeghi na ha anaghị asụ asụsụ Igbo.
Obodo ha dị n'okpuruọchịchị Oshielu, ha kọwaara ha ndị nna nna ha si n'obodo Cross River bịa biri ebe ahụ ihe karịrị afọ narị abụọ.
Ụfọdụ aha ha na-aza abụghị aha ndị Igbo mana site n'omenala gụnyere iri ji ọhụrụ na ịkpa nkata mere ha ji nwee nkwenye na ha bụ ndị Igbo.
Kirie akụkọ ha n'uju;