Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Super Eagles anaghị atụ onye ọbụla egwu
Mgbe e biputara ya
Onye ntaakụkọ BBC na Lọndọn bụ Peter Okwoche gbara ụmụ afọ Naịjirịa bị na Lọndọn ajụjụ maka ebumnobi ha n'ebe Super Eagles nọ.
Ha kwuru na super Eagles ga-eme nkeọma n'asọmpi Iko Mba Ụwa nke Rọshịa 2018, na ha ga-eru agba anọ ma ọ bụ ọkara ikpeazụ.
Ha gara n'ihu kwuo na onweghị otu bọọlụ ọbụla ndị Super Eagles na-atụ egwu.
Onye ọzọ kwuru na ọ bụ mba Beljọm ka ọ na-atụ egwu n'asọmpi ahụ.