Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Agụụ na ahụhụ ndị gbara ọsọndụ na-gabiga na Cross River steeti
Ihe dịka mmadụ puku anọ si Kamerun gbata ọsọ ndu na Naijirịa enweghị ebe obibi maọbụ ịhe oriri zuru oke ha ga-eri na ebe ha nọ bụ n'obodo a na-akpọ Boki na Cross River steeti.
Ndị ọsọndụ ahụ kwuru na ndị obodo Boki na-enye ha nri mana ọnaghị ezụ ha oke, ọlụ ntaakụkọ Guardian na ekwu.
Ọnụọgụgụ agụrụ gosiri na ndị ọsọndụ nọ na steeti ahụ eruola puku iri atọ na isii.
Ndị a si na ha na-agba ọsọ mmegbụ ndị na-asụ Frenchị na-emegbu ndị na-asụ bekee na mba Kamerun.
Otu nwoke n'ime ndị a a na-akpọ Ojong Steven gwara ndị ntaakụkọ Guardian na ọ bụ onye obodo Kajivo na mpaghara ndịda ọdịda anyanwu Kamerun.
Ọ sị: "mụ na ezi na ụlọm ruru iri na otu n'ọnụ ọgụgụ gbara ọsọndụ nke a maka agha na-ada na Kamerun ugbua".
O kwuru na ndị Bashụ ebe ha nọ na-agba mbo mana ihe ndị ha na-ewete ezughi oke maka na ha bụ ndị ọsọ agha kariri ndị obodo ahụ n'ọnụọgụgụ.
Onwere ụfọdụ ndị ọsọndụ a na-arahụ na mbara n'ịhi na ha neweghị ebe obibi.