Etu ụlọelu ogogo 13 si dakpọọ na mba Kenya

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu ụlọ nwere ọtụtụ ogogo bụ nke a ka na-erụ erụ adaal n'ehihie ụbọchị Fraịde 23 Ọktoba 2026, n'okporoụzọ 9th street dị na mpaghara Eastleigh nke Nairobi.

Akụkọ kwuru na ọrụ gbatagbata amalitela ozugbo dịka e kwuru na ọtụtụ mmadụ nwereike ịtọ n'ime mkpọmkpọ ebe nke ụlọ ahụ dara.

Mgbe ihe a mere gasịrị, ndị uweojii na-ahụ maka ọgbaaghara ji anwụrụ anya mmiri gaasị chụsasịa ndị bi ebe ahụ gbochiri ụzọ ndị gawara ebe ahụ.

Onyonyoo ndị na-efesa na soshal midịa gosiri etu ụlọ ahụ siri da. A kọrọ na ahịa na-azụ n'ụlọahịa dị n'ala ụlọ ahụ mgba ihe mberede ahụ mere.

Onye hụrụ ihe merenụ gwara BBC na ụjọ ji ndị mmadụ n'ogbe ahụ mgbe ụlọ ahụ dara. O kwuru na ihe mberede ahụ mere oge ọrụ na-aga n'ihu, ebe ndị mmadụ kpechara ekpere ụbọchị Fraịde.

"Ọ bụ ihe dị egwu, onye ọ bụla nọ ebe ahụ tụrụ ụjọ," ka o kwuru.

Omar Ahmed, onye nhazi kọmitii ndị ahịa agbataobi Eastleigh, ma bụrụkwa onye nọ ebe ahụ ihe mere, gwara BBC na ụlọ ahụ dara ada nwere ihe dịka ala iri na abụọ ma a na-atụ anya na a ga-emepe ya n'oge na-adịghị anya.

O kwukwara na ụlọahịa ndị dị n'ala ala mepere emepe, dịka ndị mmadụ nọkwa n'ime ụlọahịa ahụ mgbe ụlọ ahụ dara.

"Anyị nụrụ olu otu onye nne na-eti mkpu ma na-agụ nkwupụta okwukwe nke ndị Alakụba. Otu nwaokoroọbịa nọkwa na-eti mkpu, na-asị, 'Nwanne m nwoke nọ n'ime ụlọ ahụ,'" ka Omar kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị na-eme atụmatụ ịkwabata n'ụlọ ahụ nọ n'ime ya na-eleta akụkụ ya dị iche iche dịka ha sokwa na ndị nọ ebe ahụ n'oge ụlọ ahụ dara ada.

Ka ọ dị ugbua, amatabeghị mmadụ ole nwụrụ n'ihe mberede ahụ na oke mmebi ndị mebiri emebi, mana ndị ọrụ gbatagbata nọ ebe ahụ.