Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ndị so na nke afọ a banyere n'ụlọ taa
Nde naịra iri anọ na ise ka mmadụ iri na isii na-agba ọsọ ya na ihe ngosi Big Brother Naija nke afọ a.
Agba nke atọ ya bụ ihe ngosi malitere taa dịka ndị so na ya banyere n'ụlọ ebe ha-anọ ọnwa atọ.
Ihe a kpọrọ ihe nkiri nke afọ a bụ "BBN: Double Wahala".
Ụmụ Naịjirịa ebidola ikwuokwu gbasara ya bụ ihe nkiri. Demola Expoze gosipụtara ndị mmadụ iri na abụọ buru ụzọ banye n'ụlọ
Ọrụ ndị nọ n'ihe nkiri nke agba bidoro n'ọnụụzọ ka ha na-abanye.
Mmadụ iri na isii nọ n'ụlọ BBN afọ a
Mmadụ anọ bu ụzọ banye n'ụlọ bụ ndị a
1. Anto
2. Cee-c
3. Lolu
4. Tobi
Mmadụ anọ ndị soter ha bụ
1. Alex
2. Dee-one
3. Princess
4. Miracle
Ndị nke atọ bụ
1. Ahneeka
2. Rico Swavey
3. Bam Bam
4. Peto
Ndị nke ikpeazụ bụ ndị a
1. Leo
2. Khloe
3. Angel
4. Ifu
Otu ihe dị iche bụ na ndị niile so n'ihe nkiri a nke afọ nwere ezigbo aka ọrụ bụ ihe na-emepụta tupu ha abata n'ụlọ.