Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
2019: Buhari ekwuola na ya ekpebibeghị ịzọ ọchịchị
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru nke a na nzụkọ ya na ndị Gọvanọ APC nwere n'abalị ụnyaahụ.
Isi okwu nzụkọ ahụ bụ ịkwado Buhari ka ọ ga-niru zọọ ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2019 na-abịa.
Buhari sara ndị Gọvanọ ahụ si ha nye ya oge zuru oke ka ya nwe ike kpebie n'ime onwe ya tupu o kwuputa ebumnuche ya maka ntuliaka ahụ.
Onyeisi ndị otu Gọvanọ ahụ bụ Rochas Okorocha gwara ndị ntaakụkọ na ha kpakọrịtara maka ihe dị ịcheịche metụtara ala Naịjiria ọkachasị ọnọdụ pati ha na ọzụzọ ọchịchị Buhari.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Okorocha kwuru na ọ ga-amasị ndị Gọvanọ ahụ ma ọ bụrụ na Buhari zọọ ọchịchị n'ihi na ọ na-eme ọfụma.
Nke a bụ ugboro abụọ Buhari na ndị Gọvanọ APC na-enwe nzụkọ n'ime otu izuụka.