Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Iba Lasa abanyelaa ihe ruru steeti 20 na Naịjiria
Ịba Lasa na-aga njem ugbua egbuola mmadụ 142 n'obodo 20 n'ala Naịjiria ebe echere n'ihe ruru mmadụ 400 bu ọrịa ahụ n'ime ahụ ha.
Ngalaba na-ahụ maka ọgwụgwọ ọrịa dị icheiche a kpọrọ NCDC n'aha ịchafụ bụ ndị na-ewepụta ọnụọgụgụ a nke mere n'izuụka bidoro Maachị 26.
O gosi kwara na ndịọrụ abụọ na-ahụ maka ahụisike n'ụlọọgwụ dị icheiche, otu n'Abia eferela n'ọnwụ site n'ọrịa iba Lasa a.
Obodo Edo, Ondo, Bauchi, Plateau, Anambra, Ebonyi, Nassarawa, Kogi, Lagos, Osun na Abia so na ndị ọrịa a metụtara.
N'ime ọnụgụgụ niile ndị nwere ọrịa a, pasentị 81 nke kachasị sị n'Edo steeti.
Edo steeti bụ kwa ebe e nwere ụlọọgwụ pụrụiche na-ahụ maka nyocha n'ọgwụgwọ ịba lasa a n'obodo Irrua.