Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Steeti 25 akwadola atụmatụ ihiwe 'State Police' na Nigeria
Steeti iri abụọ na ise na Nigeria akwadola ka e nwee ndị uweojii nke steeti.
Nke a mezuru ọnụọgụgụ ụzọ abụọ n'ime atọ (2/3) dị mkpa dịka ọ dị n'iwu Nigeria iji hiwe atụmatụ ahụ.
Cheta na ụlọnnochiteanya Nigeria binyere aka n'akwụkwọ Iwu nke steeti n'abalị 10 nke ọnwa Juun, ebe ụlọomeiwu Ukwu binyere ya aka n'abali 24 nke ọnwa Juun ma zigara Ụlọomeiwu nke state 36 dị na Nigeria akwụkwọ ahụ n'abalị 16 nke ọnwa Septemba ka ha binye ya aka na nkwado.
Steeti ndị kwadoro atụmatụ ahụ
Steeti ndị anabatala atụmatụ a gụnyere; Abia, Adamawa, Akwa Ibom, Anambra, Bayelsa, Benue, Cross River, Delta, Edo, Ekiti, Enugu, Gombe, Imo, Kaduna, Kebbi, Kwara, Nasarawa, Ogun, Osun, Oyo, Plateau, Rivers, Taraba, Yobe na Zamfara.
Steeti ndị a na-eche mkpebi ha
Kano State ka na-atule atụmatụ uweojii nke steeti n'ụlọomeiwu ha, ebe Bauchi na Katsina ka na-enyocha ya n'ime kọmitii, dịka a ka na-eche mkpebi Jigawa, Lagos na Niger.
Usoro ime Iwu Uweojii nke Steeti
Usoro ọzọ bụ iziga mkpebi ụlọomeiwu state ndị ahụ n'Ụlọomeiwu Etiti ka e nyochaa ma kwado ha, tupu e zigara Onyeisiala maka nkwado ikpeazụ.
Mịnịstrị ikpe ziri ezi ga-enyocha ma kọwaa ọrụ, ego, na nlekọta ndị uweojii steeti.
N'okpuru atụmatụ a, steeti ọbụla chọrọ inwe ndị uweojii nke ya ga-ebu ụzọ mee iwu ga-ehiwe ha, ma mezuo usoro niile Gọọmentị Etiti hiwere.
A gaghị amalite ọrụ ndị uweojii steeti ruo mgbe e nyochara steeti ahụ ma nye ya asambodo, ebe Gọọmentị Etiti ga-anọgide na-elekọta ha.