Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Oby Ezekwesili a ga-ebute mgbanwe Naịjirịa chọrọ?
Aha Oby Ezekwesili yiri ọkụ na-agba n'ụgụrụ ugbua dịka ọ na-ewu ebe niile.
Ọ bụ n'ihi ozi o depụtara ụnyaahụ na ya esonyela ọsọ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.
Ụfọdụ na-ekwu na ọ nweghi ike ị meri Buhari na ndị ọzọ na ntuliaka ahụ.
Ndị ọzọ na-ekwu na ọbụrụ na ihe niile dị nhatanha, ọ bụ Ezekwesili kwesiri ịchị Naịjirịa.
Mana n'ihe a niile, Oby Ezekwesili ekwuola na ihe oji abịa bụ "Olileanya".
Onye na-ekwuchitere ya ọnụ n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Dare Babatunde gwara BBC Igbo n'ekwentị na Ezekwesili bụ ihe na-agụ Naịjirịa ugbua.
"Anyị na-achọ onye ga-emebi ihe dị ugbua ma wugharia ya, ọ bụ ya ka Oby ga-eme".
Akụkọ ga-amasị gị