Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
2019 Election : Onyeisiala ga-edozi akụnaụba Naijiria kachasị mkpa - OBJ
Mgbe e biputara ya
Onye chiburu dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola n'ala a chọrọ onye mara maka ihe gbasara akụnụba nke ọma.
O kwuru na o nweghị ka onye enweghị nghọta maka akụnaụba Naijiria ga-esi emeta ndị ọ na-achị mma.
Ọbasanjo kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ụka Foursquare Gospel Church nwere n'isi ụlọụka ha dị na Yaba, Legọs.
O nweghị onye Obasanjo kpọrọ aha n'ọkwụ ya mana ọ katọbuola onyeisiala Muhammadu Buhari ugboro ugboro dịka o siri gbasa akụnaụba Naịjirịa.
O degaburu Buhari akwụkwọ ozi n'afọ gara aga gwa ya ka ọ ghara ịzọ ọkwa ọchịchị na 2019 n'ihi, n'uche ya, okwu akụnaụba edoghị Buhari anya.