Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Uzọma Asagwara: Ihe ise ịmaghị maka nwa ada Igbo a
Nwafọ Igbo ọzọ achakeela n'ala Bekee mgbe o nwetara mmeri dịka onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Manitoba na mba Kanada.
Uzoama, onye otu pati NDP(New Democratic Party) so na ndị isiojii atọ banyere ụlọomeiwu mpaghara ahụ kemgbe afọ 150.
Lee ihe ise ndị ọzọ ị maghị maka nwa ada Igbo a:
1. Tupu o nweta oche dịka omeiwu, Asagwara bụ onye nọọsụ nlekọta ndị na-arịa isi na uche doro anya
2. Nwada Igbo bụ onye ụmụahịa, Abịa steeti bụ onye a mara dịka onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye.
3. Nna ya bụ KC Asagwara bụ onye nkuzi a ma ama na mba Kanada.
4. O bụ onye na-akụburu mba Kanada 'Basketball'
5. Uzoma gbara naanị afọ 25
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọkwa ọhụrụ Uzoma banyere na ya:
@FBanks7 kwuru na ada igbo mara mma abanyela n'ụlọomeiwu Manitoba na Canada.
@OmayraIssa kwuru na nke a bụ nnukwu ihe n'ihi na o mere na mpaghara ebe ndị isi ojii enweghị ọnụ okwu.