Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Unicef ekwuola na Naịjirịa bụ 11 n'ụwa n'ọnwụ ụmụaka
Mgbe e biputara ya
Ndị otu United Nations Children Fund (Unicef), wepụtara akwụkwọ gosiri na Naịjịrịa nọ n'ọkwa 11 gbasara ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ, n'ụwa.
Ha kwuru na ụmụaka iri abụọ na itoolu na-anwụ n'ime otu puku amụrụ ọhụrụ na Naịjirịa kwa mgbe.
Ụfọdụ ihe ndị na-eme ka nwa amụrụ ọhụrụ nwụọ bụ ụbịam, ajọọ nlekọta n'ụlọọgwụ na agha.
Akụkọ ahụ gosiri na ọnụọgụgụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ nwụrụ na Naịjirịa ebelatala mana a ka ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na ha chọrọ imezu ihe ha kpọrọ Sustainable Development Goals.
Unicef kwukwara na mpaghara sub-saharan Afịrịka bụ ndị asatọ n'ime iri ebe ndị jọrọ njọ nne nwere ike ịmụ nwa ya.