Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
inec agaghị agba akwụkwọ ntuliaka ndị ewereghị ọkụ
Inec si n'ọnụ onye odee akwụkwọ na-enyere onyeisi ngalaba ha aka bụ Rotimi Oyekanmi kwuo n'akụkọ a abughi eziokwu.
Oyekanmi gwara BBC n'elu ekwentị n'onweghị mgbe inec kwadoro ị gba akwụkwọ a na-akpọ ''PVC'' n'olu bekee ọkụ.
Ọ sị na-akụkọ a nwereike ị pụta maka na ndị mmadụ aghọtaghị ihe Rufus Akeju bụ onyeisi inec n'Ondo steeti kwuru maka ya bụ PVC
Oyekanmi kọwara na inec a gaghị emefụ ego ha tinyere n'ibiputa PVC ndị a kama ha nọ na-enwe mkparịtaụka maka etu ha si ga-ahazị ihe ndị a.
Ndị mmadụ ka nọ na-egosi iwe ha n'elu igwe okwu maka ndenye aha hịara ahụ na ntuliaka afọ 2019.
Lee ahụmihe otu onye:
Ọ kọwara ihe mere ebe ọ gara ị denye aha ya maka ntuliaka afọ 2019 na oge o gburu ebe ahụ.