Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Leah Sharibu: Anyị aghaghị ekwu okwu- Ndịagha Naịjiria
Ọnụ na-ekwụchịtere Boko Haram bụ Brig-Gen Jude Texas Chukwu ekwuola na ndịagha Naịjirịa agaghị ekwu okwu banyere nwa Dapchị ka nọ n'aka ndị Boko Haram bụ Leah Sharibu.
Chukwu sị: "A gaghị ekwu okwu maka Dapchị n'ihi na okwu ahụ dizi gọọmentị n'aka."
Cheta na BBC Igbo na Aisha Wakil, bụ onye a na-akpọ 'Mama Boko Haram', gwara BBC Igbo na nwaada ahụ ga-alọta na mkparịtauka anyị na ya nwere.
O kwukwara na akwụghị gọọmentị etiti ụgwọ iji tọpụ ụmụaka Dapchi ha tọrọ.
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta onu ndị gọọmentị Naịjirịa, mana onyeghị onye n'ime ndị na-ekwuchitere onyeisiala Muhammadu Buhari anyị nwetara.
Leah Sharibu bụ otu n'ime umụaka 101 ndị Boko Haram tọọrọ na obodo Dapchi n'ọnwa Febụwarị. Mmadụ 105 n'ime ụmụaka alọtala, mana ha kwuru na ise n'ime ha nwụrụ n'ụzọ.