Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ndị Kọstọm akpachiela onye tụbatara ọgwụ Tramadọl
Ngalaba na-ahụ maka mbupu na mbubata ngwaahịa na Naịjirịa a na-akpọ Kọstọm kwuru na ha akpachiela ngwaahịa dị n'igbe igwe abụọ nke ọgwụ Tramadọl juru n'ime ya e si mba Ịndịa zubata.
Onyeisi ndị Kọstọm nke Tincan Island bụ Musa Abdullah kwuru na mmachi ahụ ha mere bụ maka na gọọmenti etiti amachịela mbubata ọgwụ codeine.
Ndị kọstọm jidere igbe ngwaahịa dịka a na-achọ ibupu ya n'ọdọ ụgbọ mmiri.
N'okwu Abdullah; "Agbanyeghi mbọ a na-agba ịkwụsị mbubata ọgwụ ike na Naịjirịa, ụfọdụ ndị ahịa jụrụ nchegharị ka na-eme arụ ahụ. Igbe ngwọahịa abụọ bu ọgwụ Tramadọl Hidrokloraid 225mg ka anyị jidere, anyị na ndị NAFDAC na ndị NDLEA rụkọrọ ọrụ ijide ndị ahụ."