Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Gọọmenti na-ebido ịna ego e tinyere n'ụtụ mmanya ọkụ na anwụrụ taa
Gọọmenti etiti ga-amalite taa ịna ụgwọ ụtụ ọhụrụ e tinyere na ngwọahịa mmanya ọkụ na anwụrụ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ iwu tinyere ego n'ụgwọ ụtụ dị n'anwụrụ, mmanya biya, mmanya wain, na mmanya ọkụ e si mba ofesi bubata mana o nyere amara mkpụrụ ụbọchị 90.
Nke a na-eso akwụkwọ mịnịsịta okwu ego dị n'aka bụ kemi Adeosun degara onyeisiala Buhari ka o nye iwu ka e bido ya bụ iwu.
Adeosun kwuru n'akwụkwọ iwu ahụ na mmegharị iwu ahụ ga-ebido afọ 2018 rue afọ 2020 iji belata mmetụta o nwereike imetụta ngalaba ahụ.
Dịka o si kwuo, ajọ ọrịa anwụrụ na mmanya ọkụ na-ebute ga-ebelata site n'iwu ọhụrụ a.
Ego e tinyere n'ụtụ a bụ iji kwado iwu ọhụrụ ECOWAS nke a na-ele anya ga-ewelite ego gọọmenti na-enweta ma belata mmebi ya bụ ngwọahịa.