Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Akwamozu ụmụejima jikọrọ ọnụ
Mgbe e biputara ya
Otu onye bụbu onyeisiala mba Tanzania bụ Jakaya Kikwete na ndị mịnista isii ekwuola na ha ga-aga mmemme akwamozu ụmụejima jikọrọ ọnụ a ma ama na mba ahụ taa bụ Maria na Consolata.
Ụmụejima nwụrụ ụbọchị Satọde site na nsogbu obi.
A ga-ebu ha n'otu agbati ma likwa ha n'otu ili n'ebe a na- eli ozu a kpọrọ Tosamaganga dị n' Iringa, ọdịda-anyanwụ Tanzania dịka a ga-eji obe abụọ were soro ozu ha gaa.
Maria na Consolata Mwakikuti ndị jikọrọ bido na utube gbada nwerịtara otu imeju, akpaụme (lungs) mana ha nwere mkpụrụobi, abụọ, isi na aka dị iche iche.