Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ụgbọelu osote onyeisiala enweela nsogbu n'elu
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo gbanahụrụ ọdachị ụnyaahu ka ụgbọelu bu ya ga-ụlọakwụkọ akpọrọ Nigerian Customs Command and Staff College nke dị na Gwagwalada nwere nsogbu n'elu.
Ụgbọelu a, bụ nke a na-akpọ "helicopter" ebuchịghị ya azụ n'Abuja.
Osinbajo gara ụlọakwụkwọ Customs ahụ bụ ebe a na-azụ ndị ọrụ ngalaba na hụ maka ụtụisi na ngwa ahịa na-abata Naịjirịa.
Osinbajo na ndị pụtara na-agụmakwụkwọ sere foto tupu ọ gawa ebe ụgbọelu ya dị, mana ka ụgbọelu ahu fepụrụ, achọpụtara na-ụme adịghịzị ya ị naru.
Osote onyeisiala mechara jiri ụgbọala lawa, ka ahapuru ụgbọelu ahu ebe ahụ.
Onye mgbasa ozi Osinbajo bụ Laolu Akande kwuru na ọ bu ihe mebiri na ya bụ ụgbọelu mere osote onyeisiala jiri hapụ iji ụgbọelu ya la.