Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ụlọikpe amaala Dariye ikpe imefu ijeri naira 1.6
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ụlọikpe ukwu dị na Gudu, Abuja ,isiobodo Naijiria, amala onye bụbu Gọvanọ Plateau bụ Joshua Dariye ikpe imefụ ike ijeri naira 1.6, ego maka idozi ihe mbize mebiri.
Jọstis Adebukola Banjoko nke ụlọikpe a dị n'Abụja makwara Dariye ikpe maka mmerụaka dịka o siri metụta nde narị naira 250 nke e nyere ụlọọrụ Pinnacle Communications site n'ego maka idozi ihe mbize mebiri.
Ngalaba gọọmenti na-alụ ọgụ megide mpụ na mmerụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ kwupụtara nke a na Twitter.
Akụkọ ka na-abịa