Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Lee ndị na-eti egwu na-akasi D'Banj obi maka ọnwụ nwa ya
Ọtụtụ ndị a ma ama na ndị ọzọ akasiela onye oti egwu bụ D'banj na ezinaụlọ ya obi maka ọnwụ nwa ya nwoke dị naanị otu afọ.
Akụkọ kwuru na mmiri riri nwata ahụ a kpọrọ Daniel Adebanjo III n'ụlọ ha ụnyaahụ.
Ndị mmadụ gụnyere ndị a ma ama gara n'akara soshal midia ikwupụta nwute ha nakwa ịkasi Dbanj obi.
Nwaanyị na-eme ihe onyonyo bụ Funke Akindele dere n'akara ya n'Instagram na ekpere ya na-agara D'Banj na ezịnaụlọ ya maka ọnwụ ahụ.
Ebe ndị ọzọ na-arụtụaka na ọ bụ site na-akpaghị anya ezinaụlọ ahụ butere ọnwụ ha.
Ndị ama ama n'iti egwu nakwa n'ihe nkiri gụnyere Wizkid, Olamide, Banky W, Toke Makinwa, Genevieve nnaji, Wande Coal, Rita Dominic, Funke Akindele na ndị ọzọ so na ndị zigara ezinaụlọ Dbanj ozi.
Olamide zitere ozi site n'akara twitter ya kwuru na onweghi okwu ọnụ ọbụla nwere ike ị kpọhachi nwa ahụ ndụ mana ka Chineke gbaa ha ume
Wizkid site na twitter kpere ekpere ka Chineke nye ezinaụlọ Dbanj ike.
Banky W. kwuru na nke a bụ ezigbo nrọ ọjọọ ma rịọkwa ka Chineke chekwa ezinaụlọ a
Genevieve n'akara Instagram na agaghị aghọta ihe mgbu ezinaụlọ na-agabiga ugbu a mana Chineke nye ha obi i di ihe mere.
Omotala Jalade kwuru na ọ bụ Chineke na-enye ndị na-enweghi ume ndụ.
Ezinaụlọ D'Banj kwuru na ihe mere ha bụ ihe obi mgbawa.
Otu onye n'ime ezinaụlọ ha kwuru na ha achọbughị ka akụkọ ahụ pụta chacha maka na ọ bụ ihe obi mgbawa.