Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ihe otu CUPP na-eme iji 'chutu' Buhari
Ihe ruru otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị 40 kpokọtara onwe ha ọnụ ịhụ etu ha ga-esi merie Onyeisiala Muhammadu Buhari na ntuliaka 2019.
Nke a so na nnukwu ihe merela n'ime ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, ka mba a na-akwado ime ntuliaka onyeisala nakwa ọkwa ọchịchị ndị ọzọ n'ọnwa Febrụwarị 2019.
Otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), otu R-APC nakwa ọtụtụ pati ndị ọzọ binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke Bekee kpọrọ 'Memorandum of Understanding' n'Abuja taa, iji bịakọta ọnụ.
Otu ọhụrụ a kpọrọ onwe ha 'Coalition of United Political Parties' (CUPP)
Ha kwuru na ihe ha chọrọ bụ imeri Onyeisiala Buhari ma gbapụta Naijirịa n'ihe ha kpọrọ "ọchịchịrị".
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị Sinetọ nọ n'ọkwa ugbua, ndị ụlọomeiwu nta nakwa ụfọdụ gọvanọ steeti kwụnyere n'azọ ọgbakọ a.
Nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme na Naịjirịa, cheta na ụdịrị mbịakọta ọnụ a bụ ihe so nye aka ichutu Goodluck Jonathan n'ọkwa onyeisiala n'afọ 2015.