Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Minimum Wage: Etu ngagharịiwe ndị NLC si aga
Ndị otu "Nigerian Labour Congress (NLC)" ebidola ngagharịiwe taa n'ihi ụgwọ opekatampe ọhụrụ nke gọọmenti na-ekwebeghị ịkwụ ha.
N'afọ gara aga, otu gọọmentị hiwere maka inyocha ego ole a ga-akwụ ndị ọrụ wepụtara akwụkwọ ka gọọmentị kwụọ ndị ọrụ puku naịra iri atọ.
Nke a bụ ihe kpaliri iwe ndị NLC, ha ji eme ngagharịiwe na steeti niile dị na Naịjirịa.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onyeisi ndị ọrụ n'Imo Steeti bụ Austin Chilakpu, o kwuru na ngagharịiwe a bụ iji gosipụta iwe ha banyere ọnọdụ ụgwọ ọnwa opekatampe.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ka ndị mmadụ nụrụ olu ha tupu ha amalite abụbọọrụ kama na mkpebi ahụ ga-esi n'aka ndị isi ha.
Akụkọ ga-amasị gị