Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Canada Immigration: Ị chọrọ 'ịgbaga' mba a?
Mgbe e biputara ya
Mba Kanada ekwuola na ha na-atụ anya ịnabata ihe ruru mmadụ otu nde na puku narị abụọ n'ime afọ atọ na-abịa.
Nke a emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Naịjiria na-achọ ma ohere ọ ga-adịrị ha.
Nke a abụghị mbụ ndị Naịjiria na-achọkwa etu ha si agafe mba Kanada.
Mgbe e yigharịrị ntuliaka e kwesịrị ime n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị 2019, ụfọdụ ndị mmadụ malitekwara ịchọ ụzọ ha si agbaga Kanada.
O wuru ewu na soshal midia nke ọma, mere ka BBC wepụta ihe na-egosi etu ị ga-esinwu gaa (ma ike dịkwa gị o).