Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Accident: Nne adagbuola nwa ọhụrụ ya
Mgbe e biputara ya
Nwaanyị hụrụ nwa ya n'anya enwereike ịdagbu ya?
Ndị ọrụ ụlọọgwụ akpọrọ Cork University Maternity Hospital chọpụtara ozu nne na nwa nọ n'okpuru ya mgbe ha na-eme ngagharị nyocha wọọdụ.
Akụkọ na-ekwu na achọtara nne ahụ dị afọ iri atọ na nwa ya n'ala n'imeụlọ ụlọọgwụ ahụ.
Ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ gbara mbọ inye nwa ọhụrụ ọgwụgwọ gbatagbata mana o mechara nwụọ.
A na-eche na nwaanyị a si n'elu akwa ya dapụ dagbuo nwa ya mgbe onwere nsogbu ahụike ka o na-enye ya ara.
A ga-amalite nyocha ozu nne na nwa, ka -achọpụta ihe mere ha.