Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Unity Bank: E menyụọla ọkụ gbara isi ụlọọrụ Unity Bank dị na Lagos
Ọkụ ọgbụgba agbala isi ụlọọrụ Unity Bank nke dị na Victoria Island, Legọs taa bụ Monde.
Ndị ụlọrụ ahụ kwuru na ya bụ ọkụ ọgbụgba bidoro n'ụtụtụ monde ,ebe ọrụ mmenyu ọkụ emeyụtụla ya dịka ha si depụta n'akara twitter ha.
Ha depụtara na onweghị onye nwụrụ na ọkụ ọgbụgba ahụ, nchọpụta ha mere na-egosi na onweghị ụlọahịa dị n'akụkọ o metụtarala.
A mabeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.
Ihe onyonyo ọtụtụ ndị mmadụ na-egosi ka ụlọọrụ si na-agbaọkụ.
Lee ụfọdụ ihe ha gosiri na twitter.
@realsaintfamous narịọ ka enyemaka bịawa ozigbo maka mmenyu ọkụ.
Ihe onyonyo a na-egosi ndị ọrụ mmenyu ọkụ ebe ha na-agba mbọ ịmenyu ya bụ ọkụ.
Anyị ga na-ewetara ụnụ akụkọ a ka o si aga.