Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ash Wednesday: Lee ka ụkantụ si aga
Ụkantụ n'Adamawa
Taa bụ ụkantụ ndị ụka Kraịst n'ụwa niile.
Ndị otu Kraịst na-egbu ntụ n'ihe iji chetere onwe ha na mmadụ bụ aja, mmadụ ga-alọhachị n'aja.
Ndị ụka katọlik na Naịjirịa jikwa ohere a egosi iwe ha maka oke ogbugbu ndị mmadụ nakwa enweghị ezi nchekwa na Naịjirịa.
N'Adamawa, ndị ụka zakwara aha ha gosị na ha so n'ihe a na-eme.
Na Legọsi, ndị ụka gosiri onwe ha tupu ha agawa ụlọọrụ.
N'Enugwu, ndị ụka Katọlik mere ngagharị ekpere ka a kachara ụka ntụ.
Ndi ụka katọlịk nyekwara ntuzịaka ka onye ọbụla yiri ụweojii maọbụ kere akwa ojiri n'aka.
Mana na ụka ha dị na Falomo, Legọs, ọ bụghị mmadụ niile yi ya bụ akwa ojii dịka ụka siri kwuo.
Ọtụtụ ndị eyighị ya bụ akwa ojii sị na ha kwadoro maka ị ga ọrụ.
Agbanyeghị, ọtụtụ yikwa akwa ojii.
Ọtụtụ mmadụ juputara n'ụka Church of Assumption dị na Falomo, Legọs.