Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
UNGA: Ihe ndị na-akpọtụ dịka Shettima nọ New York
Dịka ọ gara ịnọchite Onyeisiala Bola Tinubu n'ọgbakọ mbaụwa United Nations General Assembly, Osote Onyeisiala Nigeria bụ Kashim Shetima ezutela ụmụafọ Nigeria bi n'America.
Ọ gwara ha maka ọrụ ọchịchị Onyeisiala Tinubu na-arụ ji hụ na Nigeria so n'ihe a na-eme ma nwee agba na mbaụwa.
O kwuru na ọrụ ahụ amịtawala mkpụrụ dịka o gosiri na ego ndokwa (foreign reserves) bụ nke ọ sịrị si ijeri dọla atọ na ụma itoolu (3.9 billion dollars) rịa ruo ijeri dọla iri ise na ise( 55 billion dollars), ọnwa atọ gara aga.
"Anyị na-arụ ọrụ iiji hazigharịa Naijiria ka ndị na-etinye ego na-akụnaụba nwee akamobi ịlaghachi na Naijiria, agamnihu ụlọọrụ nsika mmanụ 'Dangote Refinery bụ ngosipụta mbọ ahụ."
Akụkọ ka na-abịa...