Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Gọvanọ Hope Uzodimma ekwela nkwa ịnye ndị ekperima 'amnesty' ma ha chegharịa n'abalị iri
Mgbe e biputara ya
Gọọmentị Imo steeti bụ Hope Uzodimma echerela ndị ekperima niile nọ na Steeti ahụ aka udo ịnabta ha ma gbaghara ha mmehie ha ma ha chegharịa.
Gọvanọ steeti ahụ bụ onye kwuru nke a ụbịọchị Sọnde sị na ya nyere ndị ekperima a ụbọchị iri ịchegharị maọbụ ya akpọtara ha ndị agha.
Uzodimma sị na ya chọrọ iji ohere ahụ nabata ndị niile chọrọ ichegharị iji mee ka udo tọrọ atọ bata na steeti ahụ.