Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Amnesty agwala gọọmenti Nigeria ka ha nyochaa ebubo ịkpọ oku iyi ndị ụka Christ egwu
Otu 'Amnesty International' akpọọla oku ka gọọmentị Nigeria mee nnyocha banyere onyonyoo na-efegharị n'ịntanetị bụ nke gosiri ụmụaka na ndị ntoroọbịa na-akpọ oku iyi egwu na ime ihe ike megide ndị uka Kraịst na Enugu nakwa Plateau state.
Onyonyoo ahụ nke fesara n'ụbọchị Sọnde n'akara Facebook nakwa X, gosiri oge otu nwoke, ụmụaka na ndị ntoroọbịa yi uwe nke e jiri mara ndị otu Alakụba a mara nke ọma dịka Jama'atu Izalatu Bidi'a wa'iqamatus-Sunnah (JIBWIS) na-agụ egwu iyi egwu.
Amnesty International kwuru ne egwu ahụ na-akpọ oku ka e weta "egbe AK-47 iji wakpoo ndị na-ekweghị na okpukperechi ha n'ụbọchị Sọnde na Enugu nakwa Jos..."
N'ozi Amnesty International wepụtara na Mọnde, 26 Ọktoba 2026, ha kọwara omume ahụ dịka ihe na-atụ egwu, nke na-egosi etu e si enye ụmụaka ozi na-akwalite ime ihe ike na ịkpọasị okpukperechi.
Otu ahụ kpọrọ oku ka ndị ọchịchị Nigeria chọpụta ebe onyonyoo ahụ si, ebe e sere ya nakwa ndị so na ya.
O kwukwara na ọ dị mkpa ka ha nyochaa ihe omume na ihe ọmụmụ a na-eji azụlite ụmụaka nọ n'otu ahụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Otu ahụ kpọkwara oku ka e chekwaa ụmụaka ndị so na mmemme ahụ iji wepụ n'echiche ha site na-ime ihe ike n'obi ha, ma nyere ha aka kwesịrị ekwesị n'ihe gbasara ahụike uche na agụmakwụkwọ.
Amnesty International rụtụrụ aka na iwu Nigeria na iwu mba ụwa nyere gọọmentị ọrụ ichekwa ụmụaka site n'ihe ike, okwu ịkpọasị na itinye ha n'ọzụzụ agha maọbụ nke yiri agha.
Iwu ndị ahụ gụnyere 'Child Rights Act' na Nkwekọrịta Mbaụwa maka ikike Ụmụaka nke mba ndị dị n'otu.
Otu ahụ dọrọ aka na ntị na iji mmemme okpukperechị maọbụ nke ndị ntoroọbịa akụzi echiche iro n'obi ụmụaka nwere ike itinye nchekwa ha, agwa ha na ọdịnihu ha n'ihe egwu.