Kamene Okonjo: Ihe ndị ị maghị maka afọ mụrụ Ngozi Okonjo-Iweala na Eze Odinala Ọgwashị-Ukwu lara mmụọ

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nne Ngozi Okonjo-Iweala, onyeisi otu 'World Trade Organisation'(WTO) bụ Ọkammụta Kamene Okonjo alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 96.

Okonjo-Iweala, onye mara ọkwa ọnwụ ya na mgbede Ụbọchịụka, abalị 25 nke ọnwa Oktoba, afọ 2026 kwuru na nne ya nwụrụ dịka o bichara ezigbo ndụ.

Ozi ahụ nke o wepụtara n'akara ya n' ọbaozi X kwuru sị, "Taa, ozi iti aka n' obi dị ọtụtụ bịara m maka ọnwụ ezi nne m ọma.".

"Nne m biri ezigbo ndụ were rue na njedebe."

"Anyị kelere Chukwu na ọ dịrị ogologo ndụ. Ka mkpuruobi ya zuru ike na ndokwa."

Okonjo-Iweala gara n'ihu kele ndị enyi and ndị ihe ya na-amasi maka kwado ezinaụlọ ha n'oge iru ụjụ a.

Kamene Okonjo bụ onye gụrụ akwụkwọ, lụọ di gụrụ akwụkwọ(di ya Chukwuka Okonjo bụ 'mathematician nakwa economist) ma bụrụkwa nne ndị gụwara isi.

Onye bụdị Kamene Okonjo?

Ọkammụta Kamene Okonjo bụ nne onyeisi otu 'World Trade Organisation'(WTO) bụ Ngozi Okonjo-Iweala.

Nwaanyị ahụ bụbu Ọkammụta 'Sociology' na Mahadum 'University of Nigeria Nsukka' bụkwa nne Obi nke Ọgwashi-Ukwu ugbua bụ, Obi (Dr.) Ifechukwude Aninshi Okonjo.

Ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ na-abụ ọkammụta Sociology na Nigeria.

N'abalị itoolu nke ọnwa Disemba afọ 2012, ndị ntọ tọọrọ Ọkammụta Kamene Okonjo n'ụlọ ya na Delta State, oge nwa ya nwaanyị bụ Ngozi Okonjo-Iweala bụ Mịnịsta Nigeria na-ahụ maka ego na akụnaụba.

Nwa ya nwaanyị bụ Okonjo Iweala rụrụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n' akwụkwọ o dere ọ kpọrọ 'Fighting Corruption is Dangerous', sị na ọ bụ ọgụ ọ lụrụ megide nrụrụaka mere ndị mkpocha na nzacha ọ na-eme na gọọmentị metụtara jiri kpaa nkata tọrọ nne ya.

E mechara tọhapụ ya, ma nwuchie ndị uweojii abụọ bụ ndị kwesirị ị nọ ọrụ oge a tọọrọ odogwu nwaanyị ahụ mana, o nweghị onye e kpere ikpe maka ntọ ahụ.

Ya na di ya bụ Ọkammụta Chukwuka Okonjo lụrụ onwe ha afọ 66 ma mụta ụmụ asaa nke otu n'ime ha bụ Ngozi Okonjo Iweala, nwaanyị a na-anụ ụda aha ya na mba ụwa.

Di Kamene Okonjo ya lara mmụọ n'afo 2019 ka ọ gbachara afọ 91 bụkwa Obi Ọgwashi-Ukwu tupu ọ nwụọ.