Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Gọọmenti Nigeria amawapụtala ọkpụrụkpụ ego iji chere Ebola aka mgba - Ali Pate
Nigeria na-agbalịsiike ịkpachi Ebola dịka a chọpụtarala naanị otu onye bu ya. Ndị na-ahụ maka ahụike na-agba mbọ ịchọta ndị niile ha na onye ahụ nwere mmetụta ahụ, mee ha nnyocha ma gwakwa ụlọọgwụ niile e nwere na Nigeria ka ha mụrụ anya.
Ọ bụ Minista na-ahụ maka ahụike bụ Prof Muhammad Ali Pate gwara BBC nke a na mkparịtaụka pụrụiche.
Ali Pate kwuru na nwaanyị ahụ bubatara Ebola na Nigeria na-enweta onwe ya nke ọma ma na-egosikwa ihe mgbaama na ọ na-agbake.
"Nke bụ eziokwu bụ na anyị chere na ọ pụtala n'ọnọdụ ọjọọ. Ọnọdụ ahụike ya adịwala mma n'ụzọ doro anya. O nweela ike ikwu okwu. Nke a dị iche n'ihe ọnọdụ ya bụ ụbọchị atọ maọbụ anọ gara aga," ka o kwuru.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara ahụike ụmụnwaanyị
Ihe kachasị bụrụ mkpa gọọmenti ugbua bụ igbochi mfesa ọrịa ahụ na mba kachasị nwee ụbara mmadụ n'Africa, ebe ọnụọgụ mmadụ bi n'obodo ndị mepere emepe karịrị usoro nlekọta ahụike, ma bụrụkwa nke nwereike ịkụnye ụkwụ na mbọ iji kpachie ya.
A na-elebara ndị ọrụ ahụike, ndị nnyocha ahụike, ndị na-edowe ogige ọcha na ndị ọzọ ha na nwaanyị ahụ nwere mmetụta anya, ebe ndị e chere na ha nwereike ibute ọrịa ahụ ka e wezugara iche ma na-elebara ha anya.
"Ka ọ dị ugbua, ọ bụ naanị otu onye bu ọrịa a. Mana ọtụtụ nnyocha na-aga n'ihu. Anyị ga-agakwa n'ihu ime ka ndị Nigeria mara ka o si aga. Anyị nwere ụlọọgwụ 14 na-enyocha ọrịa a. Ihe niile a bụ iji nyere anyị aka mee nnyocha niile kwesịrị ekwesị ma chọpụta ma o nwere onye ya na nwaanyị ahụ nwere mmetụta ahụ butere ya," ka Pate kwuru.
Iji buo agha megide ọrịa a nke ọma, gọọmenti ewepụtala ijeri naịra iri ($6.7m) maka ọrụ gbatagbata, iji kwalite nnyocha ahụ, ịzụta ngwa nchekwa, iwere ndị ọrụ ahụike nakwa iji kwalite ụzọ ndị ọzọ e si ebuso ọrịa a agha.
Ndị ọrụ ahụike na-anata ọzụzụ gburugburu Nigeria iji kwadoo onwe ha nke ọma ma a sị e nwee ntiwapụ ọrịa Ebola.
Ali Pate kwuru na Nigeria gbapere usoro ịza oku gbatagbata ozugba ha chọpụtara onye mbụ nwere Ebola, ma gwa ụlọorụ na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) n'ime elekere 24.
A gwala ụlọọgwụ niile e nwere na Nigeria ka ha hiwe ogige mwezuga ndị ọrịa maka ndị e chere na ha ebutela Ebola.
Nigeria bụ otu n'ime mba ndị ntiwapụ Ebola metụtara n'ọdịda anyanwụ Africa na nso nso a, bụ nke gburu ọtụtụ mmadụ na mpaghara ahụ.
Mana otu ajụjụ onye niile kpụ n'ọnụ bụ gbasara ebe nwaanyị ahụ siri bute Ebola. Africa CDC kwuru na ọ gara Uganda maka ezumike tupu ọ bịa Nigeria. Ndị ọchịchị Uganda agọnarịla okwu e kwuru na ọ bụ na mba ha ka o siri bute ọrịa ahụ.
Pate kwuru na nnyocha ka na-aga n'ihu ma dọọ aka na ntị megide inwe mkpebi n'oge na-erughị eru.
A-agbanyeghị obi mmapụ na oke ụjọ dị n'obodo, obi siri ndị ọchịchị Nigeria ike na ha ga-akpachi ntiwapụ a, dịka ha rụtụrụ aka n'ụzọ Nigeria siri mee ya n'afọ 2014.