Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Enyimba na Akwa United agaala ihu n'asọmpi CAF
Otu ewguregwu bọọlụ Enyimba nke Aba na Akwa United nke Akwa Ibom wetara okike ịga ihu n'asọmpi CAF Confederations Cup ka ha merichara ndị ha na ha sọrọ mpi ụnyaahụ.
Enyimba ji 3-2 merie otu egwuregwu Energie nke Bene repọblik na Calabar, ebe Akwa United gbara ndị Al Ittihad nke Libiya 3-2 n'Uyo.
Ọ bụ penarity ka eji mechie asọmpị Akwa United na Al Ittihad. Akwa United nyere otu ọkpụ goolu n'egwuregwu a, mana n'ihi na Ittihad ji 1-0 merie ha na Libiya, egwuregwu ahụ banyere penarity.
Onye nche goolu Akwa United bụ Ojo Olorunleke nwụdere penarity atọ iji nyere ndị otu ya aka inweta mmeri.
Ndị otu egwuregwu Naịjirịa ọzọ so n'asọmpị CAF a achịtaghị aja ma ọlị.
Etoile du Sahel nke Tunisia gbara Plateau United 1-0 na Kano ka MFM nke Lagos buuru akpa ha lawa ka MC Akger nke Algeria gbara ha 2-1.
Plateau na MFM ga-asọzị mpi iji mara onye ga-aga ihu n'agba nke a na-akpọ "group stages" n'asụsụ Bekee, nke Iko CAF a.