Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.

Kpọga m na weebụsaịtị izizi

Anyị enweghị atụmatụ iwepụ akwụkwọ ego naịra ọhụrụ - Ụlọakụ etiti

Ụlọakụ etiti Naịjirịa kwuru na a ga-akwụsị iri ego ochie n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ a dịka ụlọikpe kachasi si nye ha iwu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ndị uweojii akpọpụla ọgụụ egwu 'Portable' n'ụlọikpe

    Ndị uweojii akpọpụla onye otiegwu a maama dịka Portable nke ezigbo aha ya bụ Habeeb Adunni Olawunmi Okikiola n’ụlọikpe taata.

    A na-ebo ya ebubo maka mwakpo. Ndị uweojii kpọpụrụ ya n’ụlọikpe nke ukwu dị n’Ifo n’Ogun Steeti.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Muyiwa Ogunjobi si na “Portable nwere ihe karịrị ebubo isii e jiri jide ya, dịkwa iche n’ebubo na o tikwara onye uweojii ihe.

    A ga-amakwa ya iwu maka iti mmadụ ihe n’Ọta, onye bụ nwaamadị dere akwụkwọ nye ndị uweojii nye kọmịshọna ndị uweojii n’Ogun steeti.”

  2. Anyị etinyela ọkọlọtọ Rọshịa n'obodo Bakhmut - Ndị agha Wagner

    Onyeisi ndị agha egoro ego Wagner na-alụrụ mba Rọshịa ọgụ bụ Yevgeny Prigozhin ekwuola na ha etinyela ọkọlọtọ mba Rọshịa na mpaghara Bakhmut nke dị na mba Yukren.

    Ọ bụ n'ihe onyonyo ka o kwuru nke a ma sị na ndị agha Yukren ka gbadoro ụkwụ n'ala na mpaghara ndịda anyanwụ Bakhmut.

    O ruola ọnwa olemaole ndị agha Rọshịa na-achọ ịnapụa Yukren obodo Bkhmut kama onyeisi agha ndị mba Yukren na-ekwu na ndị agha ha ka nọ na Bakhmut ma sị ka ndị mmadụ hapụ ịge ntị maka ndị na-ekwu okwu mmeri ebe ha enwetabeghị mmeri ọbụla.

    Puku pụrụ puku ndị agha mba Rọshịa na Yukren anwụọla maka ọgụ obodo Bakhmut, ebe mịnịsta nchekwa mba Briten na-ekwu na ọ ga-adịrị Rọshịa mfe ịwakpo ebe ndị ọzọ na mba Yukren ma ha nweta obodo Bakhmut.

  3. Unu abọọla chi

    Unu niile ga-erite uru taata n'aha Chukwu okike.

    Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị