Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.

Kpọga m na weebụsaịtị izizi

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Alex Otti akwụsịla ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension' n'Abịa Steeti

    Aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti abịanyela aka n’iwu iji machie ịkwụ ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ pension.

    Ọ bụ n’ụbọchị Tọzde 21 Maachị 2024 ka Gọvanọ Otti bịanyere aka n’iwu ahụ bụ nke a maara ugbua dịka ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions (Repeal) Law 2024’.

    N’oge ọ na-abịanye aka n’iwu ahụ, Gọvanọ Otti kwuru na gọọmenti abụghị maka mmasị nke onwe n’ihi na mmasị nke onwe na-ebibi gọọmenti.

    Dịka o siri kwuo “tupu iwu ọhụrụ a apụta, ọtụtụ mmadụ ndị na-eso ihe anyị na-eme ghọtara na anyị agaghị agakwa n’ihu na-akwụ ndị ọchịchị pụrụ apụ ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ na ego mmachi akpa ndị ọzọ.”

    Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu Abịa Steeti nọọrọ bufee atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu nke dị adị na Steeti ahụ bụ nke nyere ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ.

  2. Etu ụmụaka atọ si mie ala n'Imo Steeti ma bụrụ ndị a na-achọ achọ kamgbe otu izuụka

  3. Ọ naghị ewute m na m kagburu ntuliaka mba Senegal - Macky Sall

  4. Lee otu agha nnupuisi dị iche iche na-achọ iwere ọchịchị na mba Haiti

  5. Gọọmenti Enugwu ewerela katapila kwọgbuo ọkụkọ karịrị 30,000 na Nchatancha Nike

  6. Igbo Culture: Gịnị bụ Ikoro na uru ọ bara n’omenala Igbo?

  7. Onitsha building collaspe: "Amaghị m na ụlọ anyị nọ n'ime ya na-ada ada ruo mgbe m hụrụ onwe m n'ime ụvụrụ aja"

  8. Ọ bụghị ndị Hausa maọbụ Fulani wakporo ụmụakwụkwọ FUTO - Ndị uweojii

  9. Rotimi Akeredolu: Etu ụka olili ya na njem ikpeazụ ya si aga

  10. "Onye Igbo ọbụla esonyekwala na ngagharị iwe ọbụla" - Ohaneze

  11. Cost of living: Lee ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ si ebighari ndụ ugbua maka ihe isi ike na Naịjirịa

  12. Electoral Fraud: Kedụ ụdị wuruwuru dị iche iche a na-eme na ntuliaka? Kedụ ka a ga-esi kwụsị ha?

  13. Ahụhụ Naịjirịa na-ata ugbua sitere n'iwu ọjọọ ndị e mere n'oge gara aga - Benjamin Kalu

  14. Hage Geingob bụ onyeisiala mba Namibia anwụọla ka ọ gbachara afọ 82

  15. Igwe Neni's suspension: Ihe mere Soludo ji kpọghachi Igwe Damian Ezeani

  16. Insecurity: Ntọrị ụmụaka isii, ogbugbu ndị Eze na ihe ndị na-egosi na nchekwa gba ọtọ na Naịjirịa

  17. Etu ndị ojiegbe si zuo ndị POS ohi aghara aghara ma gbuo ufọdụ n’Imo Steeti

  18. Nnamdi Kanu a chụrụ Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor na ndị Okaiwu ya ndị ọzọ? - Lee ihe anyị ma

  19. 'Aga m enweta nnwereonwe m' - Nnamdi Kanu

  20. COP28: Gịnị mere okwu ọnụọgụgụ ndị nọchite anya Naijiria n'ọgbakọ mgbanwe ihu igwe ji akpọtụ?