Otti akwụsịtụla kọmishọna na-ahụ maka ahụike ọrụ n’Abịa steeti

Ebe foto si, Alex Otti/Instagram
Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela nkwado ka a kwụsitụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dr. Ngozi Okoronkwo ọrụ.
Nke a dị n’ozi kọmịshọna mgbasaozi Abịa steeti bụ Okey Kanu tinyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024.
Dịka Kanu siri kwuo, nkwụsịtụ ọrụ ahụ bụ iji nye ohere ka e mee kọmịshọna ahụ nnyocha n’ihi ebubo ajọ akparamaagwa e boro ya.
Ozi ahụ siri na ya bụ mkpebi dabara n’atụmatụ Gọvanọ Otti ịhụ na ndị ahọpụtara n’ọkwa rụrụ ọrụ ha oge niile maka ọdịmma ụmụafọ Abịa.
Ka o siladị a gwala odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị ahụịke Abịa steeti bụ Dr. Ifeyinwa Kalu na onye ndụmọdụ pụrụiche gọvanọ n’okwu metụtara ahụike bụ Dr. Ngozi Azodo ka ha na-elekọta mịnịstrị ahụ ruo mgbe e mechara nnyocha gbasara ebubo ahụ e boro Dr. Okoronkwo.















