Luke Fleurs: Anwụchiela mmadụ isii maka ogbugbu onye ọgbaabọọlụ mba South Africa
Anwụchiela mmadụ isii maka ogbugbu onye ọgbaabọọlụ mba South Africa bụ Luke Fleurs.
Nwaokorobịa ahụ gbara afọ iri abụọ na anọ na-agbara otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs bụ onye ndị ohi ụgbọala gbagburu n’izuụka gara aga n’otu ọdụ mmanụ ụgbọala dị na Johannesburg.
N’ozi ha wepụtara, ndị uweojii kwuru na mmadụ isii ahụ a na-enyo enyo bụ ndị anwụchiri na Soweto n’ụtụtụ Wenezde 10 Eprel 2024.
Ndị uweojii kwuru na ha kwenyere na “ndị ahụ a na-enyo enyo so n’otu na-ezu ohi ụgbọala” na mpaghara Gauteng.
Ha kwukwara na ha ebughachitela ụgbọala onye ọgbaabọọlụ ahụ nwụrụ anwụ n’ụbọchị Mọnde.
Fleurs bụ onye kwụ n’ahịrị na-eche ka agbanyere ya mmanụ ụgbọala tupu ndị ojiegbe awụchaa ma nye ya iwu ka ọ pụta n’ụgbọala ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Gauteng bụ Mavela Masondo gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị ahụ na “ndị omekoome tụwara Fleurs egbe, kpọpụta ya n’ụgbọala ya ma gbaa ya egbe na mpaghara obi ya.”