Unu abọọla chi
Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Soro anyị maka akụkọ niile ga-amasị gị taa

Ebe foto si, Okonjo Iweala/Twitter
Nke na-eru anyị ntị ugbua bụ na onye bụbu Minista okwu ego dị n'aka na Naịjirịa bụ Ngọzị Okonjo Iweala eruola agba nke ngwụcha na ịzọ onye ga-abụ onyeisioche World Trade Organisation (WTO).
Ndị otu na-eme ya bụ nhọta họtakwara onye Saụt Koria bụ Yoo Myung-hee.
Ọ bụ mmadụ abụọ a ga-achịpụ ya n'ime mmadụ asatọ malitere ịzọ ya bụ ọkwa ịnọchị onyeisi nke pụrụ apụ n'ọnwa Ọgụst bụ Roberto Azevedo, bụ nke pụrụ otu afọ tupu oge ya eruo.
COSATU bụ aha ịchafụ ngalaba azụmahịa mba Saụt Afrịka, agwala ndị otu ha gbaa arụkwaghị m malite taa, iji gosi iwe maka ndị otu ha a chụrụ n’ọrụ, ndị e ji ụgwọ nakwa okwu gbasara mpụ dị iche iche.
COSATU akatọọla etu gọọmentị ha si buso ọrịa Covid-19 agha dịka ha kwuru na ihe ruru ọrụ nde abụọ furu n’ime ọnwa anọ.

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-emechi kpamkpam akwammiri third mainland dị na Legọs ruo ụbọchị atọ, malite n'ụbọchị Fraịde ruo ụbọchị Sọnde.
Onye kwuru nke a bụ onysisi nchịkọta ọrụ bụ Joshua Popoola n'ụbọchị Wenesde.
Ọ sị na ọ bụ ka o nwe ndị ọrụngo ohere ịrụcha ọrụ ha nke ọma n'akwammiri ahụ.
Ebe mmechi a na-emetutaghị bụ ụzọ si Adekunle gawa Iyana Oworo.
Cheta na e mechiri otu ọkara akwammiri a n'ụbọchị 24 ọnwa Julaị ka e nwee ike rụọ ya ọrụ n'ime ọnwa isii.
Minista okwu ọrụ dị n'aka nke nta bụ Festus Keyamo arịọla ndị uweojii ka ha tọhapụ ya bụ nwaamadị sere ihe onyonyo gosiri onye SARS gburu mmadụ n'Ughelli na Delta Steeti.
Keyamo sị ndị uweojii ha tọhapụ ya Nicholas Makolomi maka na ya bụ ihe onyonyo ọ sere nyereaka ịnyopu ya bụ arụ onye uweojii ahụ mere.
Ya bụ ihe onyonyo Nicholas weputere mere ka ndị mmadụ chọo igbu otu onye uweojii anọghị n'ọrụ aha ya bụ Ohwovwiogor Fidelis n'ọdọụgbọala dị na Ughelli. Ọ kwa ndị ezigbo mmadụ ndị ọzọ zọpụtara ya bụ nwoke n'aka ọnwụ. Ya bụ ihe onyonyo pụtara na Satọde gara aga.
Ndị uweojii na-ebo Nicholas ebubo ịkpalite ọgbaaghara, ịgbasa ozi ụgha nakwa ihe ndị ọzụ bụ nke ha sị na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe.
Keyamo sị ndị uweojii ha gbahapụ ebubo niile ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Ikedi Ohakim Facebook page
Alloy Ejimako bụ Ọkaiwu Ikedi Ohakim bụ gọvanọ chiburu Imo steeti ekwuola na ha anatala akwụkwọ ikpe ahụ si n'aka ndị ụlọọrụ uweojii Naijirịa, na ha ga-asa ya n'oge na-adịghị anya.
Mbọ niile anyị gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii Naịjirịa kpụrụ n'ala dịka ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Frank Mba azaghị ekwenti ya.

Ebe foto si, Alloy Ejimako

Ebe foto si, Alloy Ejimako
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na mba United Arab Emirates ga-ebido ịnye ndị Naịjirịa akwụkwọ ikike njem site n’echi bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa ọktoba.
Cheta na mba UAE kwụsịburu ịnye ndị ala Naịjirịa akwụkwọ ikike njem mgbe ha gbapechara nke mere ka mba Naịjirịa machie ụgbọelu mba ahụ ị datu ebe ọbụla na Naịjirịa.
Ị kwadoola akpa njem gị?
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka na akụkọ nkwekọrịta n'etiti mba Naịjirịa na mba anọ ndị ọzọ gụnyere Rwanda, Amerịka nakwa Moroko.
Nke a ga-eme ya mfe mba ndị a ị bubata mmadụ na ngwa ahịa na mba ọbụla so denye aha na ya bụ akwụkwọ nkwekọrịta.
Minista na-ahụ maka omenala na mgbasaozi bụ Lai Mohammed gwara ndị ntaakụkọ na Naịjiria ga-agbado ụkwụ na nkwekọrịta a ma rite uru gbasara mwulite ọdịmma ndị mmadụ nakwa akụnaụba obodo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, FACEBOOK/ROCHAS
Rochas Okorocha bụbu gọvanọ Imo steeti esila n'ọnụ onye ndụmọdụ ya maka mgbasa ozi bụ Sam Onwuemeodo zahachi ebubo irifu ego ruru Naịra otu nari ijeri na iri na isii.
O kwuru ka Gọvanọ Hope Uzodinma wepụta nchọpụta nzụkọ nyocha nke ọkaikpe Benjamin Iheaka bụ onyeisi oche nke ga-egosi ebe ya bụ ego siri fuo ka ụwa niile were anya ha hụ.
O kwukwara ka Gọvanọ Uzodinma kwuo ije ojirila Naịra nde ijeri otu narị na iri na itolu nke sị n'ọba ego gọọmentị etiti na Naịra ijeri isii na ụma nke ISOPADEC.
Okorocha gwara Gọvanọ Uzodinma ka ọ teta n'ụra n'ihi na o ji ndị ọrụ ụgwọ ma ya mara kwa na ọ bụghị ịchụgharị Okorocha bụ ọrụ ọ ga-arụrụ ndị Imo steeti.

Ebe foto si, Ogun state government twitter page
Olamilekan Agbelesebioba eji Laycon mara na Big Brother eritela ụlọ, naira nde ise, ọkwa dịka onye nnọchiteanya ndị ntoroọbịa n’aka gọvanọ Ogun steeti bụ ebe o si.
Gọvanọ Ogun steeti bụ Dapo Abiodun depụtara n’akara twitter ya ihe nile a Laycon ritere bụ iji too agwa ọma ọ kpara na amamihe o gosiri ụwa niile n’elu onyonyo ọha na-ekiri.
Gọvanọ Abiodun kwuru na Laycon gbadoro anya agbanyeghị ọnwụwa na mkpasuiwe niile biara ya n’ihe nkiri Big Brother Lockdown.
O kwuru na nke a gosiri na akwụkwọ ọ gụrụ abụghị ihe efu.
Gọvanọ Abiodun jikwa ohere a wee kwupute na Ogun steeti na-ahazi ebe ndị na-eme egwuregwu nakwa ndị na-ese ihe ga-ezukọ iwulite ọnatarachị ha.

Ebe foto si, Ogun state government twitter page

Ebe foto si, @Ianreneville/Twitter
Akụkọ na-ekwu na kọntena bụ ibu abatala ọdọ ụgbọ mmiri nke dị n'Onisha.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala na soshal Midịa bụ Bashir Ahmed tinyere nke a na Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Gụọ ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4

Ebe foto si, Liberons Sophie/Facebook
Ezinụlo Sophie Petronin gbara afọ iri asaa na anọ bụ onye ndị otu oyi egwu nke alakụba tọrọ ekwuola na onwerela onwe ya.
Ha kwuru na o bidola njem ịloghachị isi obodo Mali bụ Bamako.
A tọrọ ya ebe ọ na-arụọrụ enyemaka na mpaghara ugwu nke Gao.
Ndị otu oyi egwu a tọhapụkwara Soumaila Cisse bụ onye zọbụrụ ọkwa onyeisiala mba ahụ.
Akụkọ na-ekwu na ntọhapụ a mere dịka ndị gọọmentị mba ahụ tọhapụrụ ihe karịrị mmadụ otu narị bụ ndị agha Jihad iji gbara isi mmadụ abụọ a.
enwebeghị ihe gọọmentị kwuru maka ihe a niile.
Soro anyị taa maka akụko ihe na-eme n'ụwa niile.
Ya gaziere gị taa!
Igbo ndị ọma, anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.
Ka ọ dịnụ echi.
Ndewo

Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu Steetị bụ Ahmad AbdurRahman ekwuola na na o nweghi ụlọ ndị uweojii awakporo n'Enugwu.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru uwojii n'Enugwu Steetị bụ Daniel Ndukwe wepụtara bụ nke sị n'akụkọ a sị na awakporo ma gbuo ndị uweojii isii bụ asị ọcha.

Kọmishọna gwara ọhanaeze na ndị Enugwu ka ha gbaa akụkọ ụgha a nkịtị na ọ bụ aka ọrụ ndị obi ọjọọ na ndị na-achọghị ọ ga n'ihu.
Ọ gara n'ihu nye iwu ka enyochaa ma chọpụta ndị malitere akụkọ ụgha ma taa ha ahụhụ ruru ha.
N'ikpeazụ ọ gwara ndị bi n'Enugwu ka ha gaa n'ihu n'ime mkpa dịịrị ha ma na-erubeisi n'iwu na-achị obodo.

Ebe foto si, Instagram/@lhilfrosh
Onye oti egwu a ma ama bụ Davido achụọla nwa ọrụ ya a kpọrọ Lil Frosh maka ịkụza enyi ya nwaanyị anya.
Ụlọọrụ ya a kpọrọ Davido Music Worldwide (DMW) sị na ha mere nke a site na nyocha ha mere banyere agwa Lil Frosh kpara.
Ha sị dịka iwu na-achị otu iti egwu ha sị dị na ha anaghị anabata ụdị akparama agwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na akụkọ pụtara n'ụbọchị Mọnde maka etu Lil Frosh si akụ enyi ya nwaanyị ihe tinka na-akụ pan.
Onyonyo nwa agbọghọ ahụ pụtara na soshal midia nke gosiri ya ebe o bu anya ikputu.
Ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka ndị uweojii nwuchie ya bụ nwaokorobịa ma kpụpụ ya ụlọikpe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu onye aha ya bụ @dahtgirl_ajex na Twitter tinyekwara ihe onyonyo na-egosi ebe Lil Frosh na-arịọ enyi ya nwaanyị mgbaghara dịka ọ kụchara ya ihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Lil Frosh bụ nwata nwaokorobịa a mụrụ n'afọ 1998 na Legọs.
Ọ gụrụ akwụkwọ elementịrị nakwa sekọndịrị na Legọs, mana ọ gabeghi mahadum.

Ebe foto si, Eucharia
Nke na-eme ugbua bụ na oke idemmiri sitere n'oke mmiri ozizo anọchiela ezi na ụzọ dị na ụfọdụ ebe n'Umueze Anam dị n'Anambra steeti.
Ndị ọrụ gbata gbata n'Anambra steeti bụ Anambra State Emergency Management Agency agbarala ndị niile bi na-ogbe ahụ ama ka ha gbaa ọsọ ndụ ha mgbe oge ka dị.

Ebe foto si, Naira Marley Instagram
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba na otiegwu ama ama bụ Naira Marley na-enwe mkparịtaụka gbasara mmegide Federal Special Anti-robbery squad(FSARS) na-emeso ụmụ Naịjirịa.
Lee ihe ha kpara maka ya:
Ihe mere Naira Marley ji yigharịa ngagharaiwe ọ chọbụrụ ime
Azeez Adeshina Fashola eji Naira Marley mara agwala ụmụ Naịjirịa ha agaghị emezi ngagharịwe gbasara mmegide ụfọdụ ndị otu Federal Special Anti-robbery squad(FSARS) na-emeso ụmụ Naịjirịa.
O kwuru na nkea bụ makana o nwere ọtụtụ mgbanwe a na-eme ugbua. N'okwu ya. "dịka ndị Marlian anyị bụ, anyị ga-enye ha otu izu ụka iji hụ mgbanwe ndị a , emeghị etu a, anyị ga-aga n'ihu mee ngagharịwe."
O jikwa ohere ahụ kwuputa na ya na onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba ga-enwe mkparịtaụka n'elekere iri na otu nke ụtụtụ Ọktoba 6,2020.
Ndị uweojii apụtabuola kwuo na ha anụla mkpesa ndị ntoroọbịa na-eme gbasara agwa ọjọ ụfọdụ ndị FSARS na-akpaso ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Naira Marley twitter