Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Mba Amerịka agbachiela nke ụgboro abụọ n'afọ a
Gọọmentị etiti mba Amerịka akwụsịla ọrụ nke ugboro abụọ n'ime afọ a maka ụlọ omeiwu emechaghị ihe ha kwesiri ime.
Ndị Sịnetị na-agba mgba ekwenyeghị nke Rand Paul, onye otu Republican kwuru mana akwụkwọ ahụ gaferela rue ụlọ omeiwu nke ukwu maka nkwado site na ntuliaka
Ụlọọrụ ndị dabere n'elu ego gọọmentị etiti ga-akwụsị ọrụ ma o ruo etiti abali.
Ọ bụrụ n' ụlọ omeiwu nke ukwu mee ntuliaka a ọsịsa, bụgara ya onyeisi ala bụ Trump tupu ụtụtụ eruo na bee ha, enwereike i gbochi mmechi gọọmenti ahụ.
Ka akụkọ na-apụta amabeghị etu mgbachi a ga-esi metụta ụlọọrụ ndị gọọmentị, amabeghị ma ndị mmadụ a ga abịa ọrụ maọbụ nọrọ n'ụlọ.