Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Pope: Ụka Katọlik akatọọla ịma mmadụ ikpe ọnwụ
Mgbe e biputara ya
Pope Francis gbanwere nkuzi ndị Ụka Katọlik ka omegide kpamkpam atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ agbanyeghi ihe ọbụla onye ahụ mere.
Nkuzi ndị ụka ahụ n'oge gara aga kwadoro ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụfọdụ ihe onye ahụ mere.
Mana ugbua onyeisi ụka ahụ bụ Pope Francis kwuru na "ọ bụ ime mmadụ ihe ike nakwa mmetọ ugwu ruru mmadụ".
Pope kwuru na-ekwesiri inye mmadụ ohere nchegharị na Chineke bụ onye kere mmadụ dị njikere ị na-aba onye nwere nchegharị.
O kwuru na ụka Kraịst ga-agba mbọ ka akachapụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụwa niile.